Cheb Nasro
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Algeria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Novemba 1969 |
Ebe ọmụmụ | Aïn Témouchent |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, omee |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1987 |
ngwa egwu | synthesizer, olu egwụ |
ụdị | raï |
akara ndekọ | Rotana Music Group |
onye nlereranya | Messaoud Bellemou |
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Algeria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Novemba 1969 |
Ebe ọmụmụ | Aïn Témouchent |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, omee |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1987 |
ngwa egwu | synthesizer, olu egwụ |
ụdị | raï |
akara ndekọ | Rotana Music Group |
onye nlereranya | Messaoud Bellemou |
Nasereddine Souïdi (Arabic: الدينيدي سو, amụrụ na 30 Nọvemba 1969), nke a maara dị ka Cheb Nasro na Nasro bụ onye na-agu egwu raï kachasị mma onye nwere ihe karịrị abọm otu narị na iri atọ na otu.[1][2][3] Nasro edekọla egwu nke gụnyere "Ndirek Amour" (M na-ahọrọ gị Ịhụnanya m) "Ma Rkhalinich" (Ahapụla M) na "Enfin Enfin" (n'ikpeazụ). Ọ bụ naanị onye na-agu egwu Raï bịanyere aka na ụlọ ọrụ egwu America, Miles Copeland ARK21/Mondo Melodia.
Akụkọ ndụ
A mụrụ Nasro Nasereddine Souidi na 30 Nọvemba 1969 na Aïn Témouchent o wee too n'obodo ọdịda anyanwụ Algeria nke Oran.[4] Oge izizi ya na egwu bịara mgbe ọ dị afọ abụọ mgbe nwanne nna ya zụtara ya drabouka (ịgba omenala). Mgbe ọ bụ nwata, ọ na-esokarị Cheb Zahounie agbamakwụkwọ na-eme ka ọ pụta ìhè mbụ mgbe ọ dị afọ iri na asaa na ụlọ ọgbakọ Nasro dị n'ógbè ahụ nwetara nkwanye ùgwù ma kpọọ ya òkù ka ọ bụrụ ihe ngosi kwa ụbọchị site na elekere nke ato nke ụtụtụ ruo elekere nke anọ na ụlọ oriri na ọṅụṅụ. N'ime otu afọ, o dekọrọ abọm mbụ ya wee malite ịrụ ọrụ na Europe dum. N'agbanyeghị asọmpi, Nasro na Cheb Hasni ghọrọ ezigbo enyi. Olileanya nke Nasro n'oge ọrụ malitere ịla n'iyi mgbe e gbuchara Cheb Hasni na September 29, 1994, mgbe ọtụtụ ndị na-agu egwu raï kwagara Europe ma ọ bụ North America, ọ bụ otu n'ime mmadụ ole na ole gara n'ihu na-abụ abụ n'ala nna ya. O mechara kwuo, sị: “Enwere m anụ ahụ́ nke ukwuu n’ihi nchegbu wee na-agagharị ọtụtụ ebe"
Ebensidee
- ↑ Cheb Nasro. Play Google.
- ↑ Cheb Nasro. Skyrock. Rabah Mezouane (6 January 2013).
- ↑ Présentation de Cheb Nasro. All for Music.
- ↑ Cheb Nasro. Retrieved on September 24, 2012.